Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 76:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye amaworo na Juda ka Chineke bu:N'Israel ka aha-Ya di uku.

2. Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.

3. N'ebe ahu ka Ọ b͕ajiri àkú nile nēb͕u àmùmà nke uta;Na ọta, na mma āgha, na agha. Selah

4. Onye juputara n'ihè ka I bu, I di ebube, nēsite n'ugwu nile nke anu adọb͕uru.

5. Akwatawo ihe ndi nwere obi ike n'agha, ha atuwo òrù-ura-ha;Ha achọtaghi kwa aka-ha, bú ndi nile bu dìnkpà.

6. Site n'ibasi-nba-ike nke Gi, Chineke nke Jekob,Ma ub͕ọ-ala ma inyinya adawo n'oké ura.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 76