Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 70:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke, bia ọsọsọ inaputam;Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.

2. Ka ihere me ha, ka ha nwe kwa iru-ihere,Bú ndi nāchọ nkpuru-obim:Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere,Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.

3. Ka ha laghachi azu n'ihi ihere-ha,Bú ndi nāsi, Ehe, ehe!

4. Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi;E, ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile,Ka Chineke di uku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 70