6. Ekwela ka ihere me ha n'ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha:Ekwela ka etiye ha n'ọnọdu-ihere n'ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel.
7. N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta;Ihere ekpuchiwo irum.
8. Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ,Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.
9. N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom;Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam.
10. M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim,O we ghọrọm nání ihe-ita-uta.
11. Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem,M'we ghọrọ ha ilu.
12. Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem;Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara.
13. Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ:Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi,Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi.
14. Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe.Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi.