4. Ha di ọtutu kari agiri-isi nke isim, bú ndi nākpọm asì n'efu:Ha nwere ume, bú ndi nēkpochapum, ebe ha bu ndi-irom n'uzọ okwu-ugha:Mb͕e ahu ka m'nēnyeghachi ihe m'nānapugh n'ike.
5. Chineke, Gi onwe-gi amawo uchem b͕agọrọ ab͕agọ;Ezonarighi kwa Gi ikpe-ọmumam nile.
6. Ekwela ka ihere me ha n'ihim, bú ndi nēle anya Gi, Chineke, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha:Ekwela ka etiye ha n'ọnọdu-ihere n'ihim, bú ndi nāchọ Gi, Chineke nke Israel.
7. N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta;Ihere ekpuchiwo irum.
8. Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ,Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.
9. N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom;Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam.
10. M'we kwa ákwá n'obubu-ọnu nke nkpuru-obim,O we ghọrọm nání ihe-ita-uta.
11. Anameme kwa ka ákwà-nkpe buru uwem,M'we ghọrọ ha ilu.
12. Ndi nānọdu n'ọnu-uzọ-ama nātughari uche bayerem;Aghọwokwam abù nke ndi nāṅu ihe-ọṅuṅu nābà n'anya nābù n'ikpọ ubọ-akwara.
13. Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ:Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi,Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi.
14. Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe.Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi.
15. Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum,Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam;Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya.
16. Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma:Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru.
17. Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi;N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam.
18. Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya:N'ihi ndi-irom b͕aputam.
19. Gi onwe-gi amawo ita-utam, na iherem, na ọnọdu-iherem:N'iru Gi ka ndi-nkpab͕um nile nọ.
20. Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike:M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula;M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula.
21. Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm;Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.
22. Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu;Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà.
23. Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ;Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile.