27. Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha:Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi.
28. Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu,Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ.
29. Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u:Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu.
30. M'gēji abù to aha Chineke,M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku.
31. Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi,Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa.
32. Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri:Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu.
33. N'ihi na Jehova nēge nti ndi-ob͕eye,Ọ ledaghi kwa ndi-nkpọrọ-Ya.
34. Ka elu-igwe na ala to Ya,Ha na oké osimiri, na ihe ọ bula nke nākpughari nime ha.
35. N'ihi na Chineke gāzọputa Zaion, wu kwa obodo nile nke Juda;Madu gēbi kwa n'ebe ahu, we nweta ya.