Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 69:21-32 Bible Nso (IGBOB)

21. Ha we nyem ńsí di ilu ka ọ buru ihe-oririm;Ọzọ mb͕e akpiri kpọrọm nku ha nēme ka m'ṅua manya-vine b͕ara uka.

22. Me table-ha nke di n'iru ha ka ọ ghọ ib͕udu;Mb͕e ha nọ n'udo, ya ghọ kwa ọnyà.

23. Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ;Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile.

24. Wukwasi ha iwe-Gi,Me kwa ka idi-ọku nke iwe-Gi rue ha aru.

25. Me ka ebe-ulo-ikwū-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu;Ekwela onye ọ bula bi n'ulo-ikwū nile ha.

26. N'ihi na ọ bu onye Gi onwe-gi tib͕uworo ka ha sob͕uworo;Ọ bu kwa akukọ bayere ihe-nb͕u nke ndi I dupuworo ka ha nākọ.

27. Tukwasi ajọ omume n'ajọ omume-ha:Ekwe-kwa-la ka ha ba n'ezi omume-Gi.

28. Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu,Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ.

29. Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u:Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu.

30. M'gēji abù to aha Chineke,M'gēji kwa ekele me ka Ọ di uku.

31. Ọ gadi kwa Jehova mma kari ehi,Ma-ọbu oke-ehi nke nwere mpi, nke ukwu-ya wara njakpa.

32. Ndi di ume-ala n'obi ahuwo ya, ha nāṅuri:Unu ndi nāchọ Chineke, ka obi-unu di ndu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 69