Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 59:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì;I gākwa mba nile emò.

9. Ikem, Gi ka m'gēlezi anya:N'ihi na Chineke bu ulo-elum.

10. Chineke nke eberem gābia izutem:Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya.

11. Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ:Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida,Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi.

12. Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu;Ka anwude kwa ha nime npako-ha,Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.

13. Me ka ha gwusia n'ọnuma-Gi, me ka ha gwusia, ka ha ghara idi ọzọ:Ka ha mara kwa na Chineke nāchi achi nime Jekob,Rue nsọtu nile nke uwa. Selah

14. Ha nālaghachi kwa n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,Nāga obodo buruburu.

15. Ndi ahu nāṅaghari iri ihe,Ọ buru na afọ ejughi ha ha gānọ kwa ọnọdu-abali.

16. Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi;E, m'gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n'ututu:N'ihi na I buruworom ulo-elu,Na ebe-nb͕alaga n'ubọchi nkpab͕u dirim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 59