Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 59:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu;Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha:N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.

8. Ma Gi onwe-gi, Jehova, gāchì ha ọchì;I gākwa mba nile emò.

9. Ikem, Gi ka m'gēlezi anya:N'ihi na Chineke bu ulo-elum.

10. Chineke nke eberem gābia izutem:Chineke gēme ka m'lekwasi ndi nēchem anwu anya.

11. Eb͕ula ha, ka ndim ghara ichezọ:Were usu-ndi-agha-Gi me ka ha nāṅaghari, me kwa ka ha rida,Onye-nwe-ayi, bú ọta-ayi.

12. Nmehie nke ọnu-ha ka okwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha bu;Ka anwude kwa ha nime npako-ha,Na n'ihi ọb͕ub͕a-iyi na n'ihi okwu-ugha nke ha nākọ akukọ-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 59