2. Naputam n'aka ndi nālu ajọ ihe,Zọputakwam n'aka ndi-ọbara.
3. N'ihi na, le, ha echewo nkpuru-obim anwu;Ndi di ike nēzukọ imegidem:Ọ bughi n'ihi njehiem, ọ bughi kwa n'ihi nmehiem, Jehova.
4. Mb͕e ọ nādighi ajọ omume m'mere ha nāb͕a ọsọ, dozie onwe-ha:Kpọte Onwe-gi izutem, hu kwa.
5. Gi onwe-gi kwa, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel,Teta ileta mba nile:Emelera ndi nāghọ aghughọ n'ajọ ihe amara. Selah
6. Ha nālaghachi n'anyasi, nāb͕ọ uja dika nkita,Nāga obodo buruburu.
7. Le, ha ji ọnu-ha nāsuputa okwu;Mma-agha di n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha:N'ihi na ònye nānu? bu ihe ha kwuru.