Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 57:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Merem amara, Chineke, merem amara;N'ihi na nime Gi ka nkpuru-obim b͕abàworo:Ọ bu kwa na ǹdò nke nkù-Gi abua ka m'gāb͕abà,Rue mb͕e ihe-ila-n'iyì ndia gāgabiga.

2. M'gākpọku Chineke Onye kachasi ihe nile elu;M'gākpọku Chineke Onye nēmezurum ihe.

3. O gēsi n'elu-igwe zìe, zọputam,Mb͕e onye nēkusi ume ike ilom nāta uta; SelahChineke gēziputa ebere-Ya na ezi-okwu-Ya.

4. Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum;M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku,Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú,Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.

5. Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke;Ka ebube-Gi di elu n'elu uwa nile.

6. Ub͕u ka ha doziworo nzọ-ukwum nile;Nkpuru-obim erudawo n'ala:Ha egwuwo olùlù n'irum;Ha adabàwo n'etiti ya. Selah

7. Edoziwo obim Chineke, edoziwo obim:M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma.

8. Teta, nsọpurum; teta, une na ubọ-akwara:M'gākpọte chi-ọbubọ.

9. M'gēkeli gi n'etiti ndi nile di iche iche, Onye-nwe-ayi:M'gābùku Gi abù ọma n'etiti mba nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 57