Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 55:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya:Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile.

12. N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta;M'gānagide kwa ya:Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem;M'gēzonari kwa ya onwem:

13. Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra,Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.

14. Ayi nāb͕akọri ìzù utọ,N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.

15. Ka ọnwu biakwasi ha na mberede,Ka ha ridarue ala-mọ na ndu:N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.

16. Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku;Jehova gāzọputakwam.

17. Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude:Ọ gānu kwa olum.

18. Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso:N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù.

19. Chineke gānu olum, weda kwa ha n'ala,Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie. SelahHa bu ndi nēnweghi nb͕anwe,Ha adighi-atu kwa egwu Chineke.

20. O setiwo aka-ya abua imegide ndi ya na ha nọ n'udo:O mewo ọb͕ub͕a-ndu-ya ka ọ ghara idi nsọ.

21. Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru,Ma nání agha ka obi-ya bu:Okwu-ya nile di nrò kari manu,Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.

22. Tukwasi Jehova ihe O nyeworo gi dika ibu, Ya onwe-ya gānagide kwa gi:Ọ gaghi-ekwe ka ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 55