Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 50:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì,We tufue okwum nile n'azu gi.

18. Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ,Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.

19. I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ,Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.

20. I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide;Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.

21. Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti;I chère na adizum ka i di:M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.

22. Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke,Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 50