Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 5:3-10 Bible Nso (IGBOB)

3. Jehova, n'ututu ka I gānu olum;N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche.

4. N'ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu:Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n'ebe I nọ.

5. Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n'anya-Gi:I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì.

6. I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì:Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú.

7. Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi:M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi.

8. Jehova, dubem n'ezi omume-Gi n'ihi ndi nēchem anwu;Me ka uzọ-Gi zie ezi n'irum.

9. N'ihi na ọ dighi ihe nke nēguzosi ike di n'ọnu-ya;Ime-ha bu ila-n'iyì nile:Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;Ha nēkwu okwu ire-utọ.

10. Ma ha ikpe, Chineke;Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha:N'uba nke njehie nile ha nupu ha;N'ihi na ha anupuwo isi imegide Gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 5