Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria,Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò:Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi.