Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 49:11-19 Bible Nso (IGBOB)

11. Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi,Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile;Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.

12. Ma madu adighi-anọgide na nsọpuru:O yiri anu nke emeworo ka ha debe ọnu-ha du n'ọnwu.

13. Uzọ-ha nka buru ha nzuzu:Ma mb͕e ha gasiri okwu-ọnu-ha nātọ madu utọ. Selah

14. Dika ìgwè ewu na aturu, ọ bu ala-mọ ka edoworo ha nye;Ọnwu gābu onye nāzù ha dika aturu:Ndi ziri ezi gēnwe ike n'aru ha n'ututu;Udi-ha bu ihe ala-mọ gēme ka ọ ka nká, ka ebe-obibi ghara idiri ya.

15. Otú ọ di, Chineke gāb͕aputa nkpuru-obim n'aka ala-mọ:N'ihi na Ọ gēkurum la. Selah

16. Atula egwu mb͕e madu nēme ọgaranya,Mb͕e nsọpuru nke ulo-ya nāba uba:

17. N'ihi na mb͕e ọ nwuru ọ gaghi-ewere ihe ahu nile la;Nsọpuru-ya agaghi-arida so ya.

18. N'ihi na mb͕e ọ di ndu ọ nāgọzi nkpuru-obi-ya,Madu nēkele kwa gi mb͕e i nēmere onwe-gi ezi ihe.

19. Ọ gābakuru ọb͕ọ nna-ya-hà;Rue mb͕e ebighi-ebi ha agaghi-ahu ìhè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 49