7. I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì:N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere giManu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi.
8. Myrrh na aloes na cassia juputara uwe-gi nile;Site n'ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara emewo ka i ṅuria ọṅu.
9. Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia:Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.
10. Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala;Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi;
11. Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike:N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya.
12. Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia;Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua.
13. Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru:Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu.
14. N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze:Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya,Anēme ha ka ha biakute gi.