Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 45:10-16 Bible Nso (IGBOB)

10. Nuru, ada, le kwa, tọ kwa nti-gi n'ala;Chezọ kwa ndi-gi, na ulo nna-gi;

11. Eze gēsi otú a chọsie ima-nma-gi ike:N'ihi na ya onwe-ya bu onye-nwe-gi; gi kpọ kwa isi ala nye ya.

12. Ada Taia gēwere kwa onyinye-inata-iru-ọma bia;Ndi-ọgaranya nke ndi-gi gēme ka iru-gi dajua.

13. Ada eze nke nọ nime ulo dichasi nsọpuru:Ihe akpagwara ọla-edo ka uwe-ya bu.

14. N'uwe akpara nke-ọma ka agēduru ya jekuru eze:Umu-ab͕ọghọ, nāmaghi nwoke ndi nēso ya n'azu, bú ndi-ibe-ya,Anēme ha ka ha biakute gi.

15. Eji ọṅù na otite-egwú-ọǹù duru ha:Ha gābà n'ulo uku eze.

16. Umu-gi gānọchi anya nna-gi-hà,I gēdo ha ndi-isi n'uwa nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 45