Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 40:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba;Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua,Jehova, Gi onwe-gi amawo.

10. Ekpuchighm ezi omume-Gi nime obim;Ekwusawom ikwesi-ntukwasi-obi-Gi na nzọputa-Gi:Ezonarighm nkpọkọta-Gi bara uba ebere-Gi na ezi-okwu-Gi

11. Gi onwe-gi, Jehova, ebochilaram obi-ebere-Gi nile:Ka ebere-Gi na ezi-okwu-Gi nēchezim mb͕e nile.

12. N'ihi na ihe ọjọ nādighi ọnu-ọgugu ab͕awom buruburu,Ajọ omumem nile eruwom aru, apughkwam ihu uzọ;Ha kariri agiri-isi nile nke isim n'uba, obim arapuwokwam.

13. Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam:Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.

14. Ka ihere me ha, ka ha nile nwe kwa iru-ihere n'otù,Bú ndi nāchọ nkpuru-obim ikpochapu ya:Ka ha laghachi azu, ka etiye kwa ha n'ọnọdu-ihere,Bú ndi ihe ọjọ dakwasirim nātọ utọ.

15. Ka ha tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ihere-ha,Bú ndi nāsim, Ehe, ehe.

16. Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi:Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile,Ka Jehova di uku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 40