Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 40:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Elesirim anya Jehova ike;Ọ we tọrọm nti-Ya n'ala, nu ntikum.

2. Ọ we me ka m'si n'olùlù nbibi, n'apiti nke ala urọ, rigoputa;Ọ we me ka ukwum abua guzo n'elu nkume di elu, Ọ nēme ka nzọ-ukwum nile guzosie ike.

3. Ọ we tiye abù ọhu n'ọnum, bú otuto diri Chineke-ayi:Ọtutu madu gāhu ya, tua egwu, We tukwasi Jehova obi.

4. Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú nwoke nke meworo Jehova ka Ọ buru ihe-ntukwasi-obi-ya,Ọ cheghi kwa ndi-nganga iru, ma-ọbu ndi nējehi n'uzọ okwu-ugha.

5. Ọtutu ihe ka Gi onwe-gi meworo, Jehova, bú Chinekem, bú oké ọlu-Gi nile,Na èchìchè-Gi nile n'ebe ayi nọ:Apughi idoro Gi ha n'usoro;Asi na agamegosi kwu kwa okwu bayere ha,Ha kariri igu-ọnu.

6. Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ;Nti abua ka I ràpúworom:Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 40