Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 37:9-19 Bible Nso (IGBOB)

9. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.

10. Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.

11. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala;Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.

12. Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.

13. Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia

14. Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da,Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:

15. Mma-agha-ha gābà n'obi onwe-ha,Agāb͕aji kwa uta-ha.

16. Ihe ntà onye ezi omume nwere di nmaKari ihe bara uba nke ọtutu ndi nēmebi iwu.

17. N'ihi na agāb͕aji ogwe-aka nke ndi nēmebi iwu:Ma Jehova nākwagide ndi ezi omume.

18. Jehova mara ubọchi nile nke ndi zuru okè:Ihe-nketa-ha gādiru kwa mb͕e ebighi-ebi.

19. Ihere agaghi-eme ha na mb͕e ihe ọjọ:Afọ gēju kwa ha n'ubọchi oké unwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 37