Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 37:31-39 Bible Nso (IGBOB)

31. Iwu Chineke-ya di n'obi-ya;Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa.

32. Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche,Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.

33. Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya,Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.

34. Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya,Ọ gēbuli kwa gi inweta ala:Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu.

35. Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji,Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.

36. O we gabiga, ma, le, ọ nọgh:M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.

37. Riba onye zuru okè ama, le kwa onye ziri ezi:N'ihi na ọdi-n'iru diri onye-udo.

38. Ma ndi-njehie, anēkpochapu ha n'otù:Agēbipu ọdi-n'iru nke ndi nēmebi iwu.

39. Ma nzọputa ndi ezi omume nēsi n'aka Jehova bia:Ọ bu ebe-ha siri ike na mb͕e nkpà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 37