Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 37:27-33 Bible Nso (IGBOB)

27. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

28. N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya,Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya;Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha:Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.

29. Ndi ezi omume gēnweta ala,Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi.

30. Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche,Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé.

31. Iwu Chineke-ya di n'obi-ya;Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa.

32. Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche,Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.

33. Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya,Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 37