Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 37:21-35 Bible Nso (IGBOB)

21. Onye nēmebi iwu nēbiri ihe, ma ọ dighi-akwughachi:Ma onye ezi omume nēme amara, nēnye kwa enye.

22. N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala;Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.

23. Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike;Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ.

24. Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya:N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya.

25. Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye;Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya,Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.

26. Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe;Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.

27. Si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe;Biri kwa rue mb͕e ebighi-ebi.

28. N'ihi na Jehova nāhu ezi ikpé n'anya,Ọ dighi-arapu kwa ndi-ebere-Ya;Rue mb͕e ebighi-ebi ka anēdebe ha:Ma agēbipu nkpuru ndi nēmebi iwu.

29. Ndi ezi omume gēnweta ala,Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi.

30. Ọnu onye ezi omume nēkwu okwu amam-ihe, dika onye nātughari uche,Ire-ya nēkwu kwa okwu ezi ikpé.

31. Iwu Chineke-ya di n'obi-ya;Nzọ-ukwu-ya nile agaghi-ab͕uchapu kwa.

32. Onye nēmebi iwu nēche onye ezi omume nche,Nāchọ kwa ime ka ọ nwua.

33. Jehova agaghi-arapu ya n'aka-ya,Ọ gaghi-ama kwa ya ikpe mb͕e anēkpe ya ikpe.

34. Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya,Ọ gēbuli kwa gi inweta ala:Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu.

35. Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji,Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 37