Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 37:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi ndi nēme ihe ọjọ,Ekwosola ndi nēme ajọ omume ekworo.

2. N'ihi na dika ahihia ka agēbipu ha ngwa ngwa,Dika akwukwọ ahihia ndu ka ha gākpọnwu.

3. Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe;Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.

4. Ka ihe Jehova tọ kwa gi utọ;Ọ gēnye kwa gi ihe nile obi-gi nāriọ.

5. Kpọre uzọ-gi ru Jehova aru;Tukwasi kwa Ya obi, Ya onwe-ya gēme kwa ya.

6. Ọ gēme kwa ka ezi omume-gi puta dika ìhè,Ikpé-gi kwa dika etiti-ehihie.

7. Nọ dū n'iru Jehova, were kwa ntachi-obi nēchere Ya:Emela ka iwe-gi di ọku n'ihi onye ọ nāgara nke-ọme n'uzọ ya,N'ihi madu nke na-eme ajọ ihe-nzube di iche iche.

8. Ra aka iwe iwe, rapu kwa ọnuma:Emela ka iwe-gi di ọku, o nēdubà nání n'ime ihe ọjọ.

9. N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ:Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.

10. Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa:I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.

11. Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala;Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.

12. Onye nēmebi iwu nēzube ajọ ihe imegide onye ezi omume,Ọ nātakwasi kwa ya ikekere-ezé.

13. Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì:N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia

14. Ndi nēmebi iwu amiputawo mma-agha, zọ kwa uta-ha ukwu ikwe ya;Ime ka onye ewedara n'ala na ob͕eye da,Ib͕u ndi ziri ezi n'uzọ-ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 37