Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 35:9-20 Bible Nso (IGBOB)

9. Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.

10. Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi?Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya,I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.

11. Ndi-àmà nke ihe-ike nēbili;Ihe nke m'nāmaghi ka ha nājum.

12. Ha nākwughachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Nkpuru-obim di ka onye b͕a aka nwa.

13. Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe:Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu;Ekperem nālaghachikute kwa obim.

14. Dika agasi na ọ burum eyì, dika agāsi na ọ burum nwa-nne, otú a ka m'jeghariri:Dika onye nēru újú nne-ya, otú a ka m'rudara n'ala nēyi uwe-nkpe.

15. Ma mb͕e m'nāru ukwu ha ṅuriri ọṅu, chikọta onwe-ha:Ha chikọtara onwe-ha imegidem, nētib͕um mb͕e m'nāmaghi;Ha dọkaram, ha eguzoghi kwa du:

16. Dika ndi emeruru emeru n'etiti ndi nāchì ọchì n'ihi ob͕e-achicha,Otú a ka ha takwasirim ikekere-ezé.

17. Onye-nwe-ayi, #mb͕e ole ka I ganēle anya?Si na ntikpọ nile ha weghachi nkpuru-obim,Si n'aka umu-ọdum weghachi nkpuru-obi m'nwere nání ya.

18. M'gēkele Gi n'etiti nkpọkọta bara uba:N'etiti otù ndi nwere ume ka m'gēto Gi.

19. Ekwela ka ndi-irom, bú ndi-okwu-ugha, ṅuam ọǹu:Ekwela ka ndi nākpọm asì mb͕e m'nēmeghi ihe b͕ue iku-anya.

20. N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu:Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 35