7. N'ihi na ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha zoberem olùlù nke ub͕u-ha,Ọ bu mb͕e m'nēmeghi ihe ka ha gwuru olùlù nye nkpuru-obim.
8. Ka ntikpọ biakwasi ya mb͕e ọ nāmaghi;Ọzọ, ka ub͕u-ya nke o zobeworo jide ya onwe-ya:Nime ntikpọ ahu, ya dabà nime ya.
9. Nkpuru-obim gēteghari kwa egwú ọṅù na Jehova:Obi gātọ ya utọ na nzọputa-Ya.
10. Ọkpukpum nile gāsi, Jehova, ònye di ka Gi?Gi Onye nānaputa onye ewedara n'ala n'aka onye di ike kari ya,I nānaputa onye ewedara n'ala na ob͕eye n'aka onye nānapu ya ihe n'ike.