Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 30:4-8 Bible Nso (IGBOB)

4. Bùkuenu Jehova abù ọma, unu ndi-ebere-Ya,Kele-kwa-nu ihe-ncheta-Ya di nsọ.

5. N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya;Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ:N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali,Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.

6. Ma mu onwem, asirim n'udom,Agaghi-ewezugam n'ọnọdum rue mb͕e egighi-ebi.

7. Jehova, I ji ka ihem si atọ Gi utọ me ka ike guzoro ukwu m:I zobere iru-Gi; aghọrọm onye nāma jijiji.

8. Gi, Jehova, ka m'nākpọku;Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi ka m'nāriọ aririọ-amara:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 30