8. Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu:Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ.
9. Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé:Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya.
10. Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwuN'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.
11. N'ihi aha-Gi, Jehova,B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.
12. Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova?O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa.
13. Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma,Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.
14. Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.
15. Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile;N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.
16. Chem iru, me-kwa-ram amara;N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu.
17. Ahuhu nile nke obim sara mbara:Me ka m'si na nkpàm nile puta.
18. Hu nweda-n'alam na ọnọdu ọjọm;Bupu kwa nmehiem nile.