Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 25:7-16 Bible Nso (IGBOB)

7. Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile:Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam,N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.

8. Onye di nma na onye ziri ezi ka Jehova bu:Nihi nka ka Ọ nēzi ndi-nmehie ihe n'uzọ.

9. Ọ nēme ka ndi di ume-ala n'obi zọ ije n'ikpé:Ọ nēzi kwa ndi di ume-ala n'obi uzọ-Ya.

10. Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwuN'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.

11. N'ihi aha-Gi, Jehova,B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.

12. Ònye ka ọ bu, bú nwoke nātu egwu Jehova?O gēzi ya ihe n'uzọ ọ nārọputa.

13. Nkpuru-obi-ya gānọ ọnọdu-abali n'ọdi-nma,Nkpuru-ya gēnweta kwa ala.

14. Ìzù nzuzo Jehova diri ndi nātu egwu Ya;Ya na ọb͕ub͕a-ndu-Ya, ime ka ha mara ihe.

15. Anyam abua di n'ebe Jehova nọ mb͕e nile;N'ihi na Ya onwe-ya gēme ka ukwum abua si n'ub͕u puta.

16. Chem iru, me-kwa-ram amara;N'ihi na onye nání ya nọ na onye ewedara n'ala ka m'bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 25