6. Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu;O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-YaZa ya site nelu-igwe-Ya di nsọ.
7. Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya:Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi.
8. Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada:Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ.