Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 19:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke;Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi.

2. Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba,Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma.

3. Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di;Anughi olu-ha.

4. N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue,Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue.O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.

5. Anyanwu ahu di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n'ulo-ndina-ya puta,Obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike ib͕aso uzọ-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 19