Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 147:6-18 Bible Nso (IGBOB)

6. Jehova nēme ka ndi di ume-ala n'obi guzo ọtọ:Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala.

7. Werenu ekele za Jehova,Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma:

8. Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe,Onye nēdoziri ala miri-ozuzo,Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia.

9. Ọ nēnye anumanu nri-ya,Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya.

10. Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ:Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ.

11. Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya,Ndi nēchere ebere-Ya.

12. Gi Jerusalem, nāja Jehova;To Chineke-gi, Zaion.

13. N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.

14. Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.

15. Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa;Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.

16. Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.

17. Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha:Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?

18. Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha:Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 147