Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 147:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike;Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi.

14. Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo;Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.

15. Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa;Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ.

16. Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu;Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu.

17. Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha:Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?

18. Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha:Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe.

19. Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya,Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 147