Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 145:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ,We gosi idi-ike-Gi nile.

5. N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi,Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche.

6. Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa;Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya.

7. Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa,Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.

8. Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu;Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere.

9. Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di;Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 145