Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 12:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, zọputa; n'ihi na onye-ebere agwusiwo;N'ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n'etiti umu madu.

2. Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya:Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.

3. Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ,Na ire nke nēkwu oké ihe:

4. Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike;Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n'akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi?

5. N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye,Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru;M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.

6. Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha;Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n'ite-nnucha nke nērusa n'ala,Nke esichaworo ub͕ò asa.

7. Gi onwe-gi, Jehova, gēdebe ha,I gēchezi ha ka ha pua n'aka ọb͕ọ a rue mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 12