71. Ọ dim nma na ewedawom n'ala;Ka m'we muta ukpuru-Gi nile.
72. Iwu ọnu-Gi dim nmaKari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu.
73. Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike:Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu.
74. Ndi nātu egwu Gi gāhum, we ṅuria;N'ihi na okwu-Gi ka m'chereworo.