134. B͕aputam na nmeb͕u nke madu:M'gēdebe kwa ihe-iriba-ama-Gi nile.
135. Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè;Zíkwam ukpuru-Gi nile.
136. Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua,N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.
137. Onye ezi omume ka I bu Jehova,Ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpé-Gi nile bu.
138. I nyewo ihe-àmà-Gi nile iwu n'ezi omumeNa ikwesi-ntukwasi-obi di uku.
139. Ekworom ekpochapuwom,N'ihi na ndi nākpab͕um echezọwo okwu-Gi nile.
140. Ihe anuchara anucha nke-uku ka okwu-ọnu-Gi bu;Orù-Gi ahuwo kwa ya n'anya.
141. Onye ntà ka m'bu, na onye anēleda anya:Ma echezọghm ihe-iriba-ama-Gi nile.
142. Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mb͕e ebighi-ebi,Iwu-Gi bu kwa ezi-okwu
143. Ahuhu na nkpà achọtawom:Ma ihe nile I nyere n'iwu bu ihe nātọm utọ nke-uku.