Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 119:118-133 Bible Nso (IGBOB)

118. I ledawo ndi nile si n'ukpuru nile Gi jehie anya,N'ihi na okwu-ugha ka aghughọ-ha bu.

119. I nēme ka ndi nile nēmebi iwu n'uwa gwusia di ka ifuru:N'ihi ya ka m'huworo ihe-àmà-Gi nile n'anya.

120. Aji anu-arum guzoro ọtọ site n'oké egwu-Gi;Ọ bu kwa ikpé-Gi nile ka m'nātu egwu ha.

121. Emewom ikpe ekpere na ezi omume:Arapulam nye ndi nēmeb͕um.

122. Buru onye-mbe nye orù-Gi na I gēmem nma:Ekwela ka ndi-nganga meb͕uem.

123. Anyam abua adalawo n'isi n'ichọsi nzọputa-Gi ike,Na n'ichọsi okwu ezi omume-Gi ike.

124. Meso orù-Gi dika ebere-Gi si di,Zíkwam ukpuru-Gi nile

125. Orù-Gi ka m'bu, me ka m'ghọta ihe,Ka m'we mara ihe-àmà-Gi nile.

126. Mb͕e eruworo Jehova ilu ọlu;Ha emebiwo iwu-Gi.

127. N'ihi nka ka m'huworo ihe nile I nyere n'iwu n'anyaKari ọla-edo, e, kari ọla-edo anuchara anucha.

128. N'ihi nka ka m'guworo ihe-iriba-ama-Gi nile, nke diri ihe nile, n'ihe ziri ezi;Uzọ okwu-ugha ọ bula ka m'kpọworo asì.

129. Oké ọlu ka ihe-àmà-Gi nile bu:N'ihi nka ka nkpuru-obim chebeworo ha.

130. Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè;Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.

131. Asaghepurum ọnum, ku kwa ume ike ike;N'ihi na achọsirim ihe nile I nyere n'iwu ike.

132. Chem iru, me-kwa-ram amara,Dika I si eme ndi nāhu aha-Gi n'anya.

133. Me ka nzọ-ukwum nile guzosie ike n'okwu-ọnu-gi:Ekwe-kwa-la ka ajọ ihe ọ bula buru onye-isim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 119