Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 116:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu,I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri,I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam.

9. M'gējeghari n'iru JehovaN'ala nile nke ndi di ndu.

10. Ekwerewom, n'ihi na m'nēkwu okwu:Ewedara mu onwem n'ala nke-uku:

11. Mu onwem siri na nkujamMadu ọ bula bu onye nēkwu okwu-ugha.

12. M'gēsi aṅa nyeghachi JehovaNmeso ọma Ya nile O mesoworom?

13. Iko nke nzọputa nile ka m'gēbuli,Ọ bu kwa aha Jehova ka m'gākpọku.

14. Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere,Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.

15. Ihe di oké ọnu-ahia n'anya JehovaKa ọnwu nke diri ndi-ebere-Ya bu.

16. Ariọm I, Jehova, n'ihi na mu onwem bu orù-Gi:Mu onwem bu orù-Gi, na nwa nke orù-Gi nwayi;I tọpuwo ab͕um nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 116