Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 116:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahurum Jehova n'anya, n'ihi na Ọ nānuOlum, bú aririọ-amaram nile.

2. N'ihi na Ọ tọwo nti-Ya n'ala n'ebe m'nọ,Ogologo ubọchi nile nke ndum ka m'ga-akpọku kwa Ya.

3. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu,Ebe nile di nkpà nke ala-mọ chọtaram:Ahuhu na iru-újú ka m'nāhu.

4. M'we kpọkue aha Jehova;Si, Biko, Jehova, me ka nkpuru-obim wepuga onwe-ya.

5. Onye-amara na onye ezi omume ka Jehova bu;E, Chineke-ayi nwere obi-ebere.

6. Onye nēdebe ndi nēnweghi uche ka Jehova bu:Enweghm ike, O we nyem nzọputa.

7. Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi;N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma.

8. N'ihi na I naputawo nkpuru-obim n'ọnwu,I naputawo kwa anyam abua n'anya-miri,I naputawo kwa ukwum abua na nnuda anēnudam.

9. M'gējeghari n'iru JehovaN'ala nile nke ndi di ndu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 116