Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 107:5-20 Bible Nso (IGBOB)

5. Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu,Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha.

6. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile.

7. O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi,Ijeru obodo obibi.

8. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

9. N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike,Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.

10. Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu,Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè;

11. N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke,Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu:

12. O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu;Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.

13. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile.

14. O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta,Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha.

15. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!

16. N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla,B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.

17. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'alaSite n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.

18. Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú;Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu.

19. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,O we zọputa ha na nkpà-ha nile.

20. O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma,O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 107