21. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya,Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu!
22. Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele,Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile.
23. Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o,Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri;
24. Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova,Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi.
25. N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ,Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.
26. Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile:Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha.
27. Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè,Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì.
28. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha,Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile.
29. Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du,Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti.