Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 106:35-47 Bible Nso (IGBOB)

35. Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu,We muta ọlu nile ha:

36. Ha we fè arusi nile ha òfùfè;Arusi ahu we ghọrọ ha ọnyà:

37. Ọzọ, ha were umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom chuara ndi-mọ ọjọ àjà,

38. We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà;Ewe were ọbara merua ala ahu.

39. Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú,Ha we nākwa iko n'omume nile ha.

40. Iwe Jehova we di ọku n'aru ndi-Ya,O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú.

41. O we nye ha n'aka mba di iche iche;Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha.

42. Ndi-iro-ha meb͕u-kwa-ra ha,Ewe me ka ha ruru ala n'okpuru aka-ha.

43. Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha;Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha,Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha.

44. O we lekwasi ahuhu diri ha anya,Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha:

45. O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha,We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.

46. O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru haN'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha.

47. Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi,Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nileIkele aha nsọ Gi,Na inya isi n'otuto-Gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 106