Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 104:16-29 Bible Nso (IGBOB)

16. Afọ nēju osisi nile nke Jehova;Bú osisi cedar nke Lebanon, nke Ọ kuworo;

17. Ebe umu-nnunu na-akù akwú:Ub͕ala, osisi fir bu ulo-ya.

18. Ugwu nile di elu diri ewu-ọhia;Nkume nile di elu buru aṅu ebe-nb͕abà.

19. O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà:Anyanwu mara ọdida-ya.

20. I nēme ka ọchichiri b͕a, o we buru abali;Nime ya ka anu nile nke oké ọhia nākpuputa.

21. Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u,N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke.

22. Anyanwu nāwa, ha we chikọta onwe-ha,We mākpuru n'ebe-obibi-ha di iche iche.

23. Madu nāpu ga ọlu-yaGa kwa ọlu-ubi-ya rue anyasi.

24. Le ka ọlu-Gi si ba uba nke-uku, Jehova!N'amam-ihe ka I meworo ha nile:Uwa juputara n'ihe I nwetara.

25. Oké osimiri ka nka bu, nke di uku, nke sa-kwa-ra mbara n'aka abua,Ebe ihe nākpu akpu di nke nādighi ọnu-ọgugu,Anu di iche iche, ma anu ntà ma anu uku.

26. N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga;Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.

27. Ha nile nēle anya Gi,Inye ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

28. I nēnye ha, ha achikọta ya;I nāsaghe aka-Gi, afọ ezi ihe eju ha.

29. I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji;I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume,We laghachi n'ájá-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 104