Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 10:5-17 Bible Nso (IGBOB)

5. Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile;Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru:Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.

6. o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum:Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ.

7. Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu:N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.

8. Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile:N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ:Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.

9. Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya:Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala:Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.

10. Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu,Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume.

11. Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo:O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.

12. Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu:Echezọla ndi ewedara n'ala.

13. N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke?Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju.

14. I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi:N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya;Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.

15. Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu;Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.

16. Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi:Mba nile ọzọ esiwo n'ala-Ya lapu n'iyì.

17. I nuwo ihe ndi di ume-ala n'obi nāchọsi ike, Jehova:I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 10