Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 10:13-17 Bible Nso (IGBOB)

13. N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke?Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju.

14. I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi:N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya;Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo.

15. Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu;Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.

16. Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi:Mba nile ọzọ esiwo n'ala-Ya lapu n'iyì.

17. I nuwo ihe ndi di ume-ala n'obi nāchọsi ike, Jehova:I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 10