Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 10:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, n'ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya?N'ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà?

2. Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku;Anējide ha na nzube nile nke ha chère.

3. N'ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n'ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike,Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova.

4. Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju.Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.

5. Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile;Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru:Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 10