Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 10:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, n'ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya?N'ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà?

2. Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku;Anējide ha na nzube nile nke ha chère.

3. N'ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n'ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike,Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova.

4. Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju.Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.

5. Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile;Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru:Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.

6. o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum:Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ.

7. Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu:N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di.

8. Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile:N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ:Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya.

9. Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya:Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala:Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.

10. Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu,Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume.

11. Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo:O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 10