Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 6:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. Ọgu eze-nwanyi atọ di, ọgu ndinyom anọ, nke bu iko, di kwa,Na umu-ab͕ọghọ nādighi ọnu-ọgugu.

9. Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè;Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu;Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu.Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma;E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya.

10. Ònye bu nwanyi a nke nēlepu anya dika ututu,Nke mara nma dika ọnwa,Nēnwu ka anyanwu,Onye anātu ujo dika usu-ndi-agha chi ọkọlọtọ?

11. Rue ubi walnut ab͕ara ogige ka m'ridara,Ilekwasi akwukwọ ndu nke ndagwurugwu anya,Ihu ma osisi vine amawo ifuru,Na ihu ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko.

12. Mb͕e m'kāmaghi, nkpuru-obim doromN'etiti ub͕ọ-ala nke ndim amara aha-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 6