Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Nke Abù 5:8-15 Bible Nso (IGBOB)

8. Ab͕awom unu iyi, unu umu-ndinyom Jerusalem, ọ buru na unu ahu onye ihe-ya nātọm utọ,Gini ka unu gēgosi ya? Na onye ọria ihu-n'anya nāria ka m'bu.

9. Gini ka onye ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Gi onye mara nma n'etiti ndinyom?Gini ka ihe-ya nātọ gi utọ bu kari onye ọzọ ihe-ya nātọ madu utọ,Na i b͕awo ayi iyi otú a?

10. Onye ihe-ya nātọm utọ di ọcha nācha kwa uhie uhie,Onye emeworo ka ọ di elu dika ọkọlọtọ kari orú nnù na nnù ise.

11. Isi-ya di ka ọla-edo ọma nke anuchara anucha,Agiri-isi-ya nēruda eruda dika igu nkwu, nēji nji dika ugolo-ọma.

12. Anya-ya abua di ka nduru n'akuku miri-iyi;Nāsa onwe-ha nime miri-ara-ehi, nānọdu n'akuku miri-iyi di iche iche juputara na miri.

13. Ǹtì-ya abua di ka nkpuru uda, dika ulo-elu nke nkpa-akwukwọ nēsì ísì utọ:Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua di ka urodi, nābusi myrrh nērù erù.

14. Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha:Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya.

15. Ogwe-ukwu-ya abua di ka ogidi marble, nke atọworo ntọ-ala-ha n'elu ukwu ọla-edo anuchara anucha:Iru-ya di ka Lebanon, mara nma nke-uku dika cedar.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Nke Abù 5